Jenesis 47

Ya mere, Josef si otu a mee ka ndị Ijipt niile ghọọ ndị ohu Fero, site nʼotu obodo nʼala ahụ ruo na nke ọzọ ya.

Genesis 47:21 (UKJV) And as for the people, he removed them to cities from one end of the borders of Egypt even to the other end thereof.

19Gịnị mere anyị ga-eji nọọ nʼagụụ nʼihu gị? Zụrụ anyị na ala anyị nʼọnọdụ ụgwọ anyị ga-akwụ maka nri ị ga-enye anyị. Ka anyị na ala anyị bụrụ ndị ohu Fero. Nye anyị mkpụrụ ubi ka anyị dịrị ndụ ghara ịnwụ, ka ala a ghara ịbụ ihe tọgbọrọ nʼefu.”

20Ya mere, Josef zụtaara Fero ala Ijipt niile. Ndị Ijipt niile nʼotu nʼotu rere ala ha nʼihi oke ụnwụ ahụ dakwasịrị ha. Mgbe ahụ, ala ha niile ghọrọ nke Fero.

21Ya mere, Josef si otu a mee ka ndị Ijipt niile ghọọ ndị ohu Fero, site nʼotu obodo nʼala ahụ ruo na nke ọzọ ya.

22Ala nke Josef na-azụtaghị nʼoge a bụ naanị ala ndị nchụaja. Nʼihi na ndị nchụaja si nʼaka Fero na-enweta nri ha site nʼoge ruo nʼoge. Ha nwekwara nri na-ezuru ha site na oke ahụ Fero na-enye ha. Ya mere ha ereghị ala ha.

23Mgbe ahụ, Josef gwara ndị mmadụ ahụ niile okwu sị, “Lee, azụọla unu taa, zụkwaa a ala unu nye Fero.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.