Jenesis 47

Mgbe ahụ, Josef gwara ndị mmadụ ahụ niile okwu sị, “Lee, azụọla unu taa, zụkwaa a ala unu nye Fero.

Genesis 47:23 (UKJV) Then Joseph said unto the people, Behold, I have bought you this day and your land for Pharaoh: lo, here is seed for you, and all of you shall sow the land.

21Ya mere, Josef si otu a mee ka ndị Ijipt niile ghọọ ndị ohu Fero, site nʼotu obodo nʼala ahụ ruo na nke ọzọ ya.

22Ala nke Josef na-azụtaghị nʼoge a bụ naanị ala ndị nchụaja. Nʼihi na ndị nchụaja si nʼaka Fero na-enweta nri ha site nʼoge ruo nʼoge. Ha nwekwara nri na-ezuru ha site na oke ahụ Fero na-enye ha. Ya mere ha ereghị ala ha.

23Mgbe ahụ, Josef gwara ndị mmadụ ahụ niile okwu sị, “Lee, azụọla unu taa, zụkwaa a ala unu nye Fero.

24Nʼoge owuwe ihe ubi, otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ihe unu nwetara nʼubi unu bụ nke Fero. Deberenụ onwe unu ụzọ anọ fọdụrụ ka ọ bụrụ ihe unu ga-akụ nʼubi na ihe unu ga-eri na ihe ndị ezinaụlọ unu, na nke ụmụntakịrị unu ga-eri.”

25Ha zara sị ya, “Ị zọpụtala ndụ anyị. Ka anyị hụta amara nʼihu nna anyị ukwu. Anyị ga-abụ ndị ohu Fero.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.