Jenesis 47

Kama, mgbe m nwụrụ, site nʼala Ijipt bupụ m. Buru ozu m gaa lie ya ebe e liri nna m ha.” Ọ zara, “Aga m eme dịka i kwuru.”

Genesis 47:30 (UKJV) But I will lie with my fathers, and you shall carry me out of Egypt, and bury me in their buryingplace. And he said, I will do as you have said.

28Jekọb biri nʼala Ijipt afọ iri na asaa. Ya mere, afọ niile Jekọb gbara bụ narị afọ na iri afọ anọ na asaa.

29Mgbe ụbọchị ọnwụ Izrel na-abịaru nso, ọ kpọrọ Josef nwa ya sị ya, “Ọ bụrụ na m ahụtala amara nʼihu gị, tinye aka gị nʼokpuru apata m, kwee m nkwa na ị ga-egosi m obi ebere na ezi ntụkwasị obi. Elila m nʼala nʼIjipt.

30Kama, mgbe m nwụrụ, site nʼala Ijipt bupụ m. Buru ozu m gaa lie ya ebe e liri nna m ha.” Ọ zara, “Aga m eme dịka i kwuru.”

31Ọ sịrị ya, “Ṅụọrọ m iyi na ị ga-eme ya.” Josef ṅụọrọ ya iyi. Izrel nʼonwe ya, kpọrọ isiala dịka ọ dabere nʼelu mkpanaka ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.