18Mgbe ahụ, Josef sịrị nna ya, “I bikwasịjọrọ aka gị. Onye a bụ ọkpara, bikwasị aka nri gị nʼisi ya.”
19Ma nna ya jụrụ, sị ya, “Amaara m ihe m na-eme nwa m, Manase ga-aghọ oke obodo, ma nwanne ya nke nta ga-akarị ya ịdị ukwuu, nʼihi na ụmụ ụmụ ya ga-aghọ ọtụtụ mba dị iche iche.”
20Ọ gọziri ha nʼụbọchị ahụ sị, “Nʼaha gị ka Izrel ga-ekwupụta ngọzị a, ‘Ka Chineke mee gị dịka Ifrem na Manase.’ ” Ya mere o buru ụzọ kpọọ Ifrem tupu Manase.
21Mgbe ahụ, Izrel gwara Josef okwu sị ya, “Lee, mụ onwe m na-aga ịnwụ. Ma Chineke ga-anọnyere unu, kpọghachikwa unu azụ nʼala nna unu ha.
22Mụ onwe m na-enye gị otu akụkụ ugwu karịa nke ụmụnne gị, bụ ala ugwu ahụ m sitere na mma agha m na ụta m napụta ndị Amọrait ka ọ bụrụ nke gị.”