Jenesis 48

Mgbe Izrel hụrụ ụmụ ndị ikom abụọ Josef kpọ bịa, ọ jụrụ Josef ajụjụ sị, “Ndị a, bụ ndị ole?”

Genesis 48:8 (UKJV) And Israel beheld Joseph's sons, and said, Who are these?

6Ma ụmụ ọzọ a ga-amụtara gị ga-abụ nke gị. Ọ bụ aha ụmụnne ha ndị a ka a ga-eji mara ha nʼala nketa nke ha.

7Ana m eme nke a nʼihi na mgbe m si Padan Aram pụta, nne unu Rechel, nwụrụ nʼala Kenan mgbe anyị ka nọ nʼụzọ ije anyị nʼebe dịtụ anya site na Efrat. Nʼakụkụ ụzọ e si aga Efrat, ya bụ Betlehem, ka m likwara ya.”

8Mgbe Izrel hụrụ ụmụ ndị ikom abụọ Josef kpọ bịa, ọ jụrụ Josef ajụjụ sị, “Ndị a, bụ ndị ole?”

9Josef zara nna ya sị, “Ha bụ ụmụ ndị ikom ndị Chineke nyere m nʼebe a.” Ya mere, Jekọb gwara ya sị, “Kpọtara m ha, ka m gọzie ha.”

10Nʼoge a, Izrel adịghị ahụzikwa ụzọ nke ọma nʼihi ime agadi ya. Ya mere, Josef duuru ụmụ ya ndị ikom ndị ahụ bịa nso ebe nna ya nọ. Mgbe ahụ, Jekọb suturu ha ọnụ, makụọ ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.