4Ọ sịrị m, ‘Lee, aga m eme ka ị mịa mkpụrụ, baakwa ụba nʼọnụọgụgụ. Aga m eme ka ị ghọọ ọgbakọ ọtụtụ mba. Aga m enye gị ala a ka ọ bụrụ ihe nketa ebighị ebi maka agbụrụ gị ndị ga-esote gị.’
5“Ugbu a, ana m eme ụmụ gị ndị ikom abụọ ndị a, ndị a mụtaara gị nʼala Ijipt, ụmụ nke m. Ha abụọ, Ifrem na Manase, ga-abụ ụmụ m, dịka Ruben na Simiọn si bụrụ ụmụ m.
6Ma ụmụ ọzọ a ga-amụtara gị ga-abụ nke gị. Ọ bụ aha ụmụnne ha ndị a ka a ga-eji mara ha nʼala nketa nke ha.
7Ana m eme nke a nʼihi na mgbe m si Padan Aram pụta, nne unu Rechel, nwụrụ nʼala Kenan mgbe anyị ka nọ nʼụzọ ije anyị nʼebe dịtụ anya site na Efrat. Nʼakụkụ ụzọ e si aga Efrat, ya bụ Betlehem, ka m likwara ya.”
8Mgbe Izrel hụrụ ụmụ ndị ikom abụọ Josef kpọ bịa, ọ jụrụ Josef ajụjụ sị, “Ndị a, bụ ndị ole?”