Jenesis 48

Ọ sịrị m, ‘Lee, aga m eme ka ị mịa mkpụrụ, baakwa ụba nʼọnụọgụgụ. Aga m eme ka ị ghọọ ọgbakọ ọtụtụ mba. Aga m enye gị ala a ka ọ bụrụ ihe nketa ebighị ebi maka agbụrụ gị ndị ga-esote gị.’

Genesis 48:4 (UKJV) And said unto me, Behold, I will make you fruitful, and multiply you, and I will make of you a multitude of people; and will give this land to your seed after you for an everlasting possession.

2Mgbe a gwara Jekọb okwu sị ya, “Nwa gị nwoke Josef abịala ileta gị.” Izrel chịkọtara ume ya, jisie ike, nọdụ ala nʼelu akwa ya.

3Mgbe ahụ, Jekọb sịrị Josef, “Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile gosiri m onwe ya na Luz, nʼala Kenan, ma gọziekwa m.

4Ọ sịrị m, ‘Lee, aga m eme ka ị mịa mkpụrụ, baakwa ụba nʼọnụọgụgụ. Aga m eme ka ị ghọọ ọgbakọ ọtụtụ mba. Aga m enye gị ala a ka ọ bụrụ ihe nketa ebighị ebi maka agbụrụ gị ndị ga-esote gị.’

5“Ugbu a, ana m eme ụmụ gị ndị ikom abụọ ndị a, ndị a mụtaara gị nʼala Ijipt, ụmụ nke m. Ha abụọ, Ifrem na Manase, ga-abụ ụmụ m, dịka Ruben na Simiọn si bụrụ ụmụ m.

6Ma ụmụ ọzọ a ga-amụtara gị ga-abụ nke gị. Ọ bụ aha ụmụnne ha ndị a ka a ga-eji mara ha nʼala nketa nke ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.