Jenesis 48

Mgbe ahụ, Jekọb sịrị Josef, “Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile gosiri m onwe ya na Luz, nʼala Kenan, ma gọziekwa m.

Genesis 48:3 (UKJV) And Jacob said unto Joseph, God Almighty appeared unto me at Luz in the land of Canaan, and blessed me,

1Mgbe ihe ndị a gasịrị, a gwara Josef sị, “Lee nna gị na-arịa ọrịa.” Josef biliri duru ụmụ ya ndị ikom abụọ bụ Manase na Ifrem gawa ileta ya.

2Mgbe a gwara Jekọb okwu sị ya, “Nwa gị nwoke Josef abịala ileta gị.” Izrel chịkọtara ume ya, jisie ike, nọdụ ala nʼelu akwa ya.

3Mgbe ahụ, Jekọb sịrị Josef, “Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile gosiri m onwe ya na Luz, nʼala Kenan, ma gọziekwa m.

4Ọ sịrị m, ‘Lee, aga m eme ka ị mịa mkpụrụ, baakwa ụba nʼọnụọgụgụ. Aga m eme ka ị ghọọ ọgbakọ ọtụtụ mba. Aga m enye gị ala a ka ọ bụrụ ihe nketa ebighị ebi maka agbụrụ gị ndị ga-esote gị.’

5“Ugbu a, ana m eme ụmụ gị ndị ikom abụọ ndị a, ndị a mụtaara gị nʼala Ijipt, ụmụ nke m. Ha abụọ, Ifrem na Manase, ga-abụ ụmụ m, dịka Ruben na Simiọn si bụrụ ụmụ m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.