23Ọnụọgụgụ nke afọ niile Enọk biri ndụ, bụ narị afọ atọ na iri afọ isii na ise.
24Enọk soro ụzọ Chineke ruo na a hụkwaghị ya nʼihi na Chineke kpọọrọ ya.
25Mgbe Metusela gbara narị afọ na iri afọ asatọ na asaa ka ọ ghọrọ nna Lamek.
26Mgbe ọ ghọchara nna Lamek, Metusela dịrị ndụ narị afọ asaa na iri afọ asatọ na abụọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
27Metusela nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ isii na itoolu.