22Mgbe ọ ghọchara nna Metusela, Enọk soro ụzọ Chineke narị afọ atọ. Nʼoge a, ọ mụtara ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
23Ọnụọgụgụ nke afọ niile Enọk biri ndụ, bụ narị afọ atọ na iri afọ isii na ise.
24Enọk soro ụzọ Chineke ruo na a hụkwaghị ya nʼihi na Chineke kpọọrọ ya.
25Mgbe Metusela gbara narị afọ na iri afọ asatọ na asaa ka ọ ghọrọ nna Lamek.
26Mgbe ọ ghọchara nna Lamek, Metusela dịrị ndụ narị afọ asaa na iri afọ asatọ na abụọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.