27Metusela nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ isii na itoolu.
28Mgbe Lamek gbara narị afọ na iri afọ asatọ na abụọ ka ọ mụtara nwa nwoke.
29Lamek gụrụ ya Noa, nʼihi na ọ sịrị: “Ọ ga-akasị anyị obi nʼime oke ọrụ na ndọgbu anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ nʼala a Onyenwe anyị bụrụ ọnụ.”
30Mgbe a mụsịrị Noa, Lamek dịrị ndụ narị afọ ise na iri afọ itoolu na ise ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.
31Lamek nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ asaa na iri afọ asaa na asaa.