18Ụmụnne ya bịakwara daa nʼihu ya, sị, “Anyị bụ ndị ohu gị.”
19Ma Josef sịrị ha, “Unu atụla egwu. Abụ m Chineke onye na-ekpe ikpe nke m ga-eji taa unu ahụhụ?
20Ọ bụ ezie na unu chere ime m ihe ọjọọ, ma Chineke chere ya ka ọ bụrụ ezi ihe, iji debe ọtụtụ ndụ dịka ọ na-eme taa.
21Ya mere, ụjọ atụla unu. Mụ onwe m ga-azụ unu na ụmụntakịrị unu.” Ọ kasịrị ha obi, gwa ha okwu bara ha nʼobi.
22Josef biri nʼIjipt, ya na ụmụnne ya, na ndị ụlọ ha. Josef gbara narị afọ na iri.