17‘Gwa Josef sị ya, Arịọọ m gị, gbaghara ihe ọjọọ niile ụmụnne gị mere, na mmehie ha mere megide gị.’ Ugbu a, gbaghara mmehie anyị bụ ndị ohu Chineke nna gị.” Mgbe Josef nụrụ ihe ha kwuru, ọ kwara akwa.
18Ụmụnne ya bịakwara daa nʼihu ya, sị, “Anyị bụ ndị ohu gị.”
19Ma Josef sịrị ha, “Unu atụla egwu. Abụ m Chineke onye na-ekpe ikpe nke m ga-eji taa unu ahụhụ?
20Ọ bụ ezie na unu chere ime m ihe ọjọọ, ma Chineke chere ya ka ọ bụrụ ezi ihe, iji debe ọtụtụ ndụ dịka ọ na-eme taa.
21Ya mere, ụjọ atụla unu. Mụ onwe m ga-azụ unu na ụmụntakịrị unu.” Ọ kasịrị ha obi, gwa ha okwu bara ha nʼobi.