Jenesis 6

Ya mere, jiri osisi gofa wuore onwe gị ụgbọ mmiri. Rụnye ọtụtụ ọnụụlọ nʼime ya. Jiri korota techie elu ya na ime ya.

Genesis 6:14 (UKJV) Make you an ark of gopher wood; rooms shall you make in the ark, and shall pitch it within and without with pitch.

12Chineke hụrụ otu ụwa si jọgbuo onwe ya na njọ, hụkwa na ụmụ mmadụ bụ ndị ihe ọjọọ riri ahụ.

13Chineke sịrị Noa, “Aga m ebibi ihe niile bụ mmadụ, nʼihi na ụwa jupụtara nʼihe ike nʼihi omume mmadụ. E e, aga m ebibi ụwa na ndị niile nọ nʼime ya.

14Ya mere, jiri osisi gofa wuore onwe gị ụgbọ mmiri. Rụnye ọtụtụ ọnụụlọ nʼime ya. Jiri korota techie elu ya na ime ya.

15Otu a ka i ga-esi wuo ya: mee ka ogologo ụgbọ mmiri ahụ dịrị narị mita na iri mita anọ, obosara ya dịrị iri mita abụọ na atọ, ịdị elu ya dịrị mita iri na atọ na ọkara.

16Meere ụgbọ mmiri ahụ ihe e ji ekpuchi elu ya. Mekwa oghere ga-adị ọkara mita site nʼebe ihe mkpuchi elu ụgbọ mmiri ahụ gbadata. Tinye ọnụ ụzọ nʼakụkụ ụgbọ mmiri ahụ, ma rụọkwa okpukpu nkwasa atọ, nke ala ala, nke etiti na nke elu elu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.