Jenesis 6

Meere ụgbọ mmiri ahụ ihe e ji ekpuchi elu ya. Mekwa oghere ga-adị ọkara mita site nʼebe ihe mkpuchi elu ụgbọ mmiri ahụ gbadata. Tinye ọnụ ụzọ nʼakụkụ ụgbọ mmiri ahụ, ma rụọkwa okpukpu nkwasa atọ, nke ala ala, nke etiti na nke elu elu.

Genesis 6:16 (UKJV) A window shall you make to the ark, and in a cubit shall you finish it above; and the door of the ark shall you set in the side thereof; with lower, second, and third stories shall you make it.

14Ya mere, jiri osisi gofa wuore onwe gị ụgbọ mmiri. Rụnye ọtụtụ ọnụụlọ nʼime ya. Jiri korota techie elu ya na ime ya.

15Otu a ka i ga-esi wuo ya: mee ka ogologo ụgbọ mmiri ahụ dịrị narị mita na iri mita anọ, obosara ya dịrị iri mita abụọ na atọ, ịdị elu ya dịrị mita iri na atọ na ọkara.

16Meere ụgbọ mmiri ahụ ihe e ji ekpuchi elu ya. Mekwa oghere ga-adị ọkara mita site nʼebe ihe mkpuchi elu ụgbọ mmiri ahụ gbadata. Tinye ọnụ ụzọ nʼakụkụ ụgbọ mmiri ahụ, ma rụọkwa okpukpu nkwasa atọ, nke ala ala, nke etiti na nke elu elu.

17Nʼihi na aga m eweta uju mmiri nʼụwa, ibibi ihe niile nwere ndụ dị nʼokpuru eluigwe. Ihe niile e kere eke na-eku ume ndụ ga-anwụ. Ihe niile nọ nʼụwa ga-ala nʼiyi.

18Ma aga m eme ka ọgbụgba ndụ m dịrị gị. Ị ga-abanye nʼụgbọ mmiri ahụ, gị na ụmụ gị ndị ikom, na nwunye gị, na ndị nwunye ụmụ gị ndị ikom.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.