Jenesis 6

Ma aga m eme ka ọgbụgba ndụ m dịrị gị. Ị ga-abanye nʼụgbọ mmiri ahụ, gị na ụmụ gị ndị ikom, na nwunye gị, na ndị nwunye ụmụ gị ndị ikom.

Genesis 6:18 (UKJV) But with you will I establish my covenant; and you shall come into the ark, you, and your sons, and your wife, and your sons' wives with you.

16Meere ụgbọ mmiri ahụ ihe e ji ekpuchi elu ya. Mekwa oghere ga-adị ọkara mita site nʼebe ihe mkpuchi elu ụgbọ mmiri ahụ gbadata. Tinye ọnụ ụzọ nʼakụkụ ụgbọ mmiri ahụ, ma rụọkwa okpukpu nkwasa atọ, nke ala ala, nke etiti na nke elu elu.

17Nʼihi na aga m eweta uju mmiri nʼụwa, ibibi ihe niile nwere ndụ dị nʼokpuru eluigwe. Ihe niile e kere eke na-eku ume ndụ ga-anwụ. Ihe niile nọ nʼụwa ga-ala nʼiyi.

18Ma aga m eme ka ọgbụgba ndụ m dịrị gị. Ị ga-abanye nʼụgbọ mmiri ahụ, gị na ụmụ gị ndị ikom, na nwunye gị, na ndị nwunye ụmụ gị ndị ikom.

19Ị ga-ewebata ihe niile e kere eke dị ndụ, abụọ abụọ, oke na nwunye, ichebe ha ndụ.

20Ụdị nnụnụ dị iche iche, abụọ abụọ, na ụdị anụmanụ ọbụla dị iche iche, na ụdị anụ na-akpụ akpụ dị iche iche, ga-abịakwute gị ka i debe ha ndụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.