17Nʼihi na aga m eweta uju mmiri nʼụwa, ibibi ihe niile nwere ndụ dị nʼokpuru eluigwe. Ihe niile e kere eke na-eku ume ndụ ga-anwụ. Ihe niile nọ nʼụwa ga-ala nʼiyi.
18Ma aga m eme ka ọgbụgba ndụ m dịrị gị. Ị ga-abanye nʼụgbọ mmiri ahụ, gị na ụmụ gị ndị ikom, na nwunye gị, na ndị nwunye ụmụ gị ndị ikom.
19Ị ga-ewebata ihe niile e kere eke dị ndụ, abụọ abụọ, oke na nwunye, ichebe ha ndụ.
20Ụdị nnụnụ dị iche iche, abụọ abụọ, na ụdị anụmanụ ọbụla dị iche iche, na ụdị anụ na-akpụ akpụ dị iche iche, ga-abịakwute gị ka i debe ha ndụ.
21Ị ga-ewebata ụdị nri dị iche iche a na-eri eri, chịkọtaa ha ka ọ bụrụ nri nke gị na nke ha.”