Jenesis 6

Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị, “Mmụọ m na mmadụ agaghị anọgide nʼịgba mgba nʼime mmadụ ruo ebighị ebi, nʼihi na mmadụ efu ka ọ bụ. Ọnụọgụgụ ndụ ya ga-abụ narị afọ na iri afọ abụọ.”

Genesis 6:3 (UKJV) And the LORD said, My spirit shall not always strive with man, for that he also is flesh: yet his days shall be an hundred and twenty years.

1Mgbe ndị mmadụ bidoro mụbaa nʼụwa, mgbe a mụtakwaara ha ọtụtụ ụmụ ndị inyom,

2ka ụmụ ndị ikom Chineke bidoro ilekwasị ụmụ ndị inyom ndị mmadụ anya, hụ na ha mara mma. Ha duuru ndị inyom ọbụla masịrị ha ka ha bụrụ nwunye ha.

3Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị, “Mmụọ m na mmadụ agaghị anọgide nʼịgba mgba nʼime mmadụ ruo ebighị ebi, nʼihi na mmadụ efu ka ọ bụ. Ọnụọgụgụ ndụ ya ga-abụ narị afọ na iri afọ abụọ.”

4Ndị Nefilim nọ nʼụwa nʼoge ahụ, ma nʼoge sotere ya mgbe ahụ, ụmụ ndị ikom Chineke na-abakwuru ndị inyom ụmụ mmadụ, site na mmekọrịta dị otu a mụọ ụmụ. Ndị a bụ ndị dike mgbe ochie ahụ, ndị a ma ama.

5Onyenwe anyị hụrụ otu ịba ụba nke ajọ omume mmadụ si dị ukwuu, hụkwa na echiche uche nke obi ya niile dị naanị nʼime ihe ọjọọ, mgbe niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.