Jenesis 6

Ma Noa nwetara ihuọma nʼanya Onyenwe anyị.

Genesis 6:8 (UKJV) But Noah found grace in the eyes of the LORD.

6O wutere Onyenwe anyị nke ukwuu na o kere mmadụ, mkpụrụobi ya jupụtakwara nʼihe mgbu.

7Nʼihi ya, Onyenwe anyị sịrị, “Aga m esi nʼụwa kpochapụ mmadụ niile m kere eke. E e, mmadụ na anụmanụ niile, na ihe e kere eke na-akpụgharị nʼelu ala, na anụ ufe niile. Nʼihi na o wutere m na m kere ha.”

8Ma Noa nwetara ihuọma nʼanya Onyenwe anyị.

9Nke a bụ akụkọ banyere usoro ndụ Noa na ezinaụlọ ya. Noa bụ onye ezi omume. Onye na-enweghị ịta ụta ọbụla nʼetiti ndị bi nʼoge ya. O mere ihe nʼụzọ Chineke chọrọ ya.

10Noa mụtara ụmụ ndị ikom atọ aha ha bụ, Shem, Ham, na Jafet.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.