19Mmiri ndị ahụ toro laa elu kpuchie ugwu ukwu niile dị nʼokpuru mbara eluigwe.
20Mmiri ndị a toro kpuchiri ugwu niile, ruo na ịla elu mmiri ndị a site nʼelu ugwu ukwu niile ruru mita asaa.
21Ihe niile nwere ndụ nke na-ejegharị nʼelu ụwa kubiri ume. Anụ ufe, na anụ ụlọ, na anụ ọhịa, na ihe niile e kere eke jupụtara nʼụwa, na ụmụ mmadụ niile.
22Ee, ihe niile na-eku ume nke bi nʼelu ala nwụrụ.
23Ihe niile nwere ume ndụ nʼelu ụwa ka e kpochapụrụ. Mmadụ na anụmanụ, na anụ na-akpụgharị nʼala na nnụnụ niile. A lara ha niile nʼiyi. Ma ọ bụ naanị Noa na ndị niile so ya nọdụ nʼụgbọ mmiri ahụ ka a hapụrụ ndụ.