1Mgbe ụbọchị ahụ zuru, Onyenwe anyị kpọrọ Noa sị ya, “Baa nʼime ụgbọ mmiri, gị na ezinaụlọ gị niile, nʼihi na nʼime ndị niile bi nʼọgbọ a, ọ bụ naanị gị bụ onye ezi omume m hụrụ.
2Kpọrọ ụmụ anụmanụ ndị a a gụrụ dịka ndị dị ọcha, dịka ụdị ha si dị asaa asaa, oke na nwunye. Otu a kwa, kpọrọkwa ụmụ anụmanụ ndị a gụrụ dịka ndị na-adịghị ọcha, dịka ụdị ha si dị, abụọ abụọ, oke na nwunye,
3na ụmụ anụ ufe asaa asaa, dịka ụdị ha si dị, oke na nwunye, maka idebe ụdị ndị a niile ndụ nʼụwa.
4Nʼihi na ụbọchị asaa site taa, aga m ezidata mmiri ozuzo nʼụwa. Mmiri a ga-ezo iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị. Aga m ekpochapụ site nʼelu ụwa ihe niile nwere ndụ nke m kere.”
5Ya mere, Noa mere ihe niile Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.