11Nʼoge anyasị, nduru a lọghachiri. Ọ kpụ akwụkwọ oliv ọhụrụ ọ kụbitere nʼọnụ ya. Nke a gosiri Noa na mmiri ahụ ataala nʼelu ala.
12Mgbe abalị asaa gafere, Noa zipụkwara nduru ahụ ọzọ. Ma nʼoge a, ọ lọtakwaghị ọzọ.
13Nʼụbọchị mbụ nke ọnwa mbụ nʼafọ narị isii na otu nke ndụ Noa, mmiri ahụ atachaala nʼelu ala. Mgbe ahụ, Noa kpughepụrụ ihe mkpuchi nke ụgbọ mmiri ahụ, hụ na mmiri atachaala nʼelu ala.
14Ma ọ bụ nʼụbọchị iri abụọ na asaa nke ọnwa abụọ ka mmiri ji takọrọchaa nʼelu ala.
15Mgbe ahụ, Chineke gwara Noa okwu sị ya,