Jenesis 8

Mgbe ahụ, Chineke gwara Noa okwu sị ya,

Genesis 8:15 (UKJV) And God spoke unto Noah, saying,

13Nʼụbọchị mbụ nke ọnwa mbụ nʼafọ narị isii na otu nke ndụ Noa, mmiri ahụ atachaala nʼelu ala. Mgbe ahụ, Noa kpughepụrụ ihe mkpuchi nke ụgbọ mmiri ahụ, hụ na mmiri atachaala nʼelu ala.

14Ma ọ bụ nʼụbọchị iri abụọ na asaa nke ọnwa abụọ ka mmiri ji takọrọchaa nʼelu ala.

15Mgbe ahụ, Chineke gwara Noa okwu sị ya,

16“Site nʼụgbọ mmiri pụta, gị na nwunye gị, na ụmụ gị ndị ikom, na ndị nwunye ụmụ gị ndị ikom.

17Kpọpụta anụ niile dị ndụ nke gị na ha nọ, anụ ufe, na ụmụ anụmanụ, na ihe e kere eke niile na-akpụgharị nʼala, ka ha gaa nʼụwa mụọ ọmụmụ, baa ụba, jupụta nʼelu ya.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.