Jenesis 8

Ma anụmanụ niile ọbụla nke dị ndụ, na ihe niile na-akpụgharị nʼala, na anụ ufe niile, ihe niile na-ejegharị nʼụwa, ka ụdị ha si dị, sitere nʼụgbọ mmiri ahụ pụta.

Genesis 8:19 (UKJV) Every beast, every creeping thing, and every fowl, and whatsoever creeps upon the earth, after their kinds, went forth out of the ark.

17Kpọpụta anụ niile dị ndụ nke gị na ha nọ, anụ ufe, na ụmụ anụmanụ, na ihe e kere eke niile na-akpụgharị nʼala, ka ha gaa nʼụwa mụọ ọmụmụ, baa ụba, jupụta nʼelu ya.”

18Ya mere, Noa si nʼụgbọ mmiri ahụ pụta, ya na ụmụ ya, na nwunye ya, na ndị nwunye ụmụ ya.

19Ma anụmanụ niile ọbụla nke dị ndụ, na ihe niile na-akpụgharị nʼala, na anụ ufe niile, ihe niile na-ejegharị nʼụwa, ka ụdị ha si dị, sitere nʼụgbọ mmiri ahụ pụta.

20Mgbe ahụ, Noa wuru ebe ịchụ aja nye Onyenwe anyị. Ọ họọrọ site nʼanụ ụlọ ndị dị ọcha na anụ ufe ndị dị ọcha chụọ aja nsure ọkụ.

21Onyenwe anyị nụrụ isisi ụtọ nke aja nsure ọkụ ahụ kwuo nʼobi ya sị, “Agaghị m abụ ala ọnụ ọzọ nʼihi mmadụ, ebe ọ bụ na izuzu obi mmadụ bụ ime ihe ọjọọ site na mgbe ọ bụ nwata, agakwaghị m ala ihe niile e kere eke na-eku ume ndụ iyi ọzọ, dịka m mere.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.