Jenesis 9

Etinyela m eke na egwurugwu m na mbara eluigwe, ka ọ bụrụ ihe ama nke ọgbụgba ndụ dị nʼetiti mụ na ụwa.

Genesis 9:13 (UKJV) I do set my bow in the cloud, and it shall be for a token of a covenant between me and the earth.

11Ebe ọ bụ na m ehiwela ọgbụgba ndụ m nʼetiti mụ na unu, ọ gaghị emekwa ọzọ na a ga-eji uju mmiri kpochapụ ihe niile e kere eke, ọ gaghị emekwa ọzọ na a ga-eji uju mmiri bibie ụwa.”

12Chineke kwuru sị, “Nke a bụ ihe ama nke ọgbụgba ndụ nke m na-etinye nʼetiti mụ na unu, na nʼetiti ihe niile nwere ndụ so unu, ọgbụgba ndụ nke ga-adị nye ọgbọ niile na-abịa nʼihu.

13Etinyela m eke na egwurugwu m na mbara eluigwe, ka ọ bụrụ ihe ama nke ọgbụgba ndụ dị nʼetiti mụ na ụwa.

14Mgbe ọbụla m zitere igwe ojii nʼụwa, ọ bụrụ na eke na egwurugwu apụta ìhè na mbara eluigwe,

15aga m echeta ọgbụgba ndụ m mere ka ọ dịrị nʼetiti mụ na unu, na nʼetiti mụ na ihe niile nwere ndụ site nʼihe niile e kere eke. Ọ gaghị emekwa ọzọ na mmiri ga-aghọ uju mmiri ibibi ihe niile nwere ndụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.