12Chineke kwuru sị, “Nke a bụ ihe ama nke ọgbụgba ndụ nke m na-etinye nʼetiti mụ na unu, na nʼetiti ihe niile nwere ndụ so unu, ọgbụgba ndụ nke ga-adị nye ọgbọ niile na-abịa nʼihu.
13Etinyela m eke na egwurugwu m na mbara eluigwe, ka ọ bụrụ ihe ama nke ọgbụgba ndụ dị nʼetiti mụ na ụwa.
14Mgbe ọbụla m zitere igwe ojii nʼụwa, ọ bụrụ na eke na egwurugwu apụta ìhè na mbara eluigwe,
15aga m echeta ọgbụgba ndụ m mere ka ọ dịrị nʼetiti mụ na unu, na nʼetiti mụ na ihe niile nwere ndụ site nʼihe niile e kere eke. Ọ gaghị emekwa ọzọ na mmiri ga-aghọ uju mmiri ibibi ihe niile nwere ndụ.
16Mgbe ọbụla eke na egwurugwu pụtara nʼigwe ojii, aga m ahụ ya cheta ọgbụgba ndụ ebighị ebi nke dị nʼetiti Chineke na ihe niile nwere ndụ site nʼihe niile e kere eke nọ nʼelu ụwa.”