15aga m echeta ọgbụgba ndụ m mere ka ọ dịrị nʼetiti mụ na unu, na nʼetiti mụ na ihe niile nwere ndụ site nʼihe niile e kere eke. Ọ gaghị emekwa ọzọ na mmiri ga-aghọ uju mmiri ibibi ihe niile nwere ndụ.
16Mgbe ọbụla eke na egwurugwu pụtara nʼigwe ojii, aga m ahụ ya cheta ọgbụgba ndụ ebighị ebi nke dị nʼetiti Chineke na ihe niile nwere ndụ site nʼihe niile e kere eke nọ nʼelu ụwa.”
17Chineke gwara Noa sị, “Nke a bụ ihe ama ọgbụgba ndụ ahụ m hiwere nʼetiti mụ na ihe niile nwere ndụ nʼụwa.”
18Ụmụ ndị ikom Noa ndị si nʼụgbọ mmiri pụta bụ Shem, Ham na Jafet. (Ham bụ nna Kenan.)
19Ndị a bụ ụmụ ndị ikom atọ Noa mụrụ. Ọ bụ site na ha ka ndị mmadụ niile gbasara nʼụwa niile si pụta.