1Mgbe ihe ndị a gasịrị, Chineke gọziri Noa na ụmụ ya sị ha: “Mụọnụ, baanụ, jupụtanụ nʼụwa.
2Egwu unu na ụjọ unu ga-adakwasị anụmanụ niile nke ụwa nke dị ndụ, na anụ ufe niile nke eluigwe, na ihe e kere eke niile na-akpụgharị nʼala, na azụ niile dị nʼosimiri. Ewerela m ha niile nyefee unu nʼaka.
3Ihe ọbụla dị ndụ nke na-ejegharị ejegharị ga-abụ nri unu. Enyela m unu ihe niile ugbu a dịka m si nye unu ahịhịa ndụ niile.
4“Ma unu agaghị eri anụ ọbụla nke ọbara ndụ ya dị ya nʼahụ.
5Ma gbasara ọbara ndụ unu, unu ga-asara ọnụ unu nʼihu m. Anụmanụ ọbụla ga-asara ọnụ ya nʼihu m. Mmadụ ọbụla kwa ga-asara ọnụ ya nʼihu m banyere ndụ mmadụ ibe ya.