Jenesis 9

“Ma unu agaghị eri anụ ọbụla nke ọbara ndụ ya dị ya nʼahụ.

Genesis 9:4 (UKJV) But flesh with the life thereof, which is the blood thereof, shall all of you not eat.

2Egwu unu na ụjọ unu ga-adakwasị anụmanụ niile nke ụwa nke dị ndụ, na anụ ufe niile nke eluigwe, na ihe e kere eke niile na-akpụgharị nʼala, na azụ niile dị nʼosimiri. Ewerela m ha niile nyefee unu nʼaka.

3Ihe ọbụla dị ndụ nke na-ejegharị ejegharị ga-abụ nri unu. Enyela m unu ihe niile ugbu a dịka m si nye unu ahịhịa ndụ niile.

4“Ma unu agaghị eri anụ ọbụla nke ọbara ndụ ya dị ya nʼahụ.

5Ma gbasara ọbara ndụ unu, unu ga-asara ọnụ unu nʼihu m. Anụmanụ ọbụla ga-asara ọnụ ya nʼihu m. Mmadụ ọbụla kwa ga-asara ọnụ ya nʼihu m banyere ndụ mmadụ ibe ya.

6“Onye ọbụla wufuru ọbara mmadụ, nʼaka mmadụ ka a ga-awụfu ọbara nke ya, nʼihi nʼoyiyi Chineke ka Chineke mere mmadụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.