11Mgbe ahụ, ha na-esi nʼebe ahụ gabiga dịka ifufe, na-agabigakwa ndị mehierenụ, bụrụkwa ndị ikpe mara, ndị ike ha bụ chi ha.”
12Onyenwe anyị, Ọ bụ na ị dịghị site mgbe niile ebighị ebi? Chineke m, na Onye Nsọ m, Ị gaghị anwụ. Gị, Onyenwe anyị, họpụtara ha maka ikpe ikpe. Gị, oke nkume m, emeela ka ha bụrụ ndị ga-enweta ahụhụ.
13Ma anya gị dị ọcha nke ukwuu, na ọ dịghị elekwasị ajọ ihe anya; ị naghị anabatakwa mmegbu. Ma gịnị mere i ji gba ndị aghụghọ nkịtị? Gịnị mere i ji gba nkịtị mgbe ndị ajọ omume na-eloda ndị bụ ndị ezi omume karịa ha?
14I meela ndị mmadụ ka ha dịrị ka azụ nke osimiri, e, dịka anụ na-akpụ akpụ nke oke osimiri, nke na-enweghị onye na-achị ha.
15Onye iro nke ajọ omume juru obi, na-eji nko ya na-egbu ha. Ọ na-ejikwa nko ụgbụ ya na-ejide ha. Ọ na-achịkọta ha nʼụgbụ ya, si otu a na-aṅụrị ọṅụ, ma na-etegharịkwa egwu ọṅụ.