9“Ahụhụ na-adịrị onye ahụ na-ewu ụlọ ya site nʼuru ọjọọ, nke na-ewukwasị akwụ ya nʼebe dị elu, nʼihi ịgbanarị mbibi nke ga-abịa.
10I sitela nʼizuzu ọjọọ gị mee ka mbibi bịakwasị ọtụtụ mmadụ, sị otu a tufuo ndụ gị, ma wetakwara ezinaụlọ gị ihere.
11Ọ bụladị nkume ahụ e ji wuo mgbidi ga-eti mkpu megide gị. Osisi e ji doo elu ụlọ ga-etikwa mkpu akwa za nkume ndị ahụ.
12“Ahụhụ dịrị onye ahụ na-eji ọbara ewu obodo, nke na-ejikwa ajọ omume eme ka obodo ahụ guzosie ike.
13Ọ bụ na ọ bụghị uche Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na ndọgbu nʼọrụ niile nke mmadụ bụ na nkịtị, ihe e ji afụnwu ọkụ, na oke ọrụ niile nke mba dị iche iche bụ ihe lara nʼiyi?