1Aga m arịgoro nʼelu ebe nche m, guzo onwe m nʼebe nchekwa ahụ. Aga m echerekwa ịhụ ihe ọ ga-agwa m, na ihe m ga-asa, banyere mkpesa ndị a.
2Mgbe ahụ Onyenwe anyị zara m sị, “Dee ọhụ ahụ nʼelu mbadamba nkume e ji ede ihe. Depụta ya nke ọma, ka onye na-agba ọsọ nwee ike ịgụ ya.
3Nʼihi na e nwere ọhụ nke ga-adị ruo oge a kara aka, ọ na-ekwu banyere oge ọgwụgwụ, Ọ gaghị abụkwa ụgha. Ọ bụrụ na ọ dịka mmezu ya adịghị abịaru ọsịịsọ, chere mmezu ya, nʼihi na ọ ga-emesịa mezuo, ọ gaghị anọ tee aka.
4“Lee, onye iro na-afụli onwe ya elu; ọchịchọ ya ezikwaghị ezi ma onye ezi omume ga-esite nʼokwukwe ya dị ndụ.
5Nʼezie, mmanya na-eduhie ya ụzọ, onye jupụtara na nganga, na-adịghị enwe ezumike. Ebe ọ bụ na o nwere anya ukwu dịka ala mmụọ, ọ gaghị enwekwa afọ ojuju dịka ọnwụ. Nʼihi na ọ na-achịkọta mba niile nye onwe ya, ọ na-adọtakwa ọtụtụ ndị mmadụ nʼagha.