8Ọ bụ osimiri, ka gị bụ Onyenwe anyị were iwe megide? Ọnụma gị, ọ dị ukwuu megide iyi niile? Oke iwe gị ọ bụ megide oke osimiri mgbe ị nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya gị, nakwa nʼelu ụgbọ ịnyịnya ị wetara ndị nke gị mmeri?
9I kpughepụrụ ụta gị, kpọọ oku ka a chịtara gị ọtụtụ àkụ. Sela I ji osimiri dị iche iche kewaa ụwa.
10Mgbe ugwu niile hụrụ gị ha nyagharịrị onwe ha nʼihi ihe mgbu bịakwasịrị ha. Oke mmiri ozuzo gabigakwara. Ogbu mmiri mere ka olu ya daa ụda, buliekwa ebili mmiri elu.
11Anyanwụ na ọnwa guzokwara duu na mbara eluigwe, mgbe ha hụrụ ihe nke àkụ gị, mgbe ha hụrụ amụma nke ùbe gị gburu.
12I sitere nʼọnụma gị zọgharịa ije nʼụwa, sitekwa nʼiwe gị zọchaa mba dị iche iche dịka ọka.