16Amara m jijiji nʼobi m mgbe m nụrụ ihe ndị a niile, egbugbere ọnụ m abụọ kụkọtara nʼegwu, ọkpụkpụ dị m nʼahụ malitere ire ure, mee ka ụkwụ m maa jijiji. Ma aga m eji ndidi chere ụbọchị ọjọọ ahụ nke ga-abịakwasị ndị ahụ na-abịa ibuso anyị agha.
17A sịkwarị na osisi fiig amaghị ifuru, na ọ dịghị mkpụrụ dị nʼosisi vaịnị, a sịkwa na mkpụrụ osisi oliv ebilata na ala ubi niile emepụtaghị ihe oriri, a sịkwa na ọ dịghị atụrụ dị nʼọgba anụ, na ọ dịkwaghị ehi nọ nʼụlọ anụmanụ,
18mụ onwe m ga-anọgide na-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị. Aga m etegharịkwa egwu ọṅụ nʼime Chineke Onye nzọpụta m.
19Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bụ ike m, ọ na-eme ụkwụ m abụọ ka ha dịka nke ele. Ọ na-emekwa ka m zọọ ije nʼebe niile dị elu. Nke a dịrị onyeisi abụ, nʼụbọ akwara m dị iche iche.