Hegai 1

Ya mere, Onyenwe anyị kwaliri mmụọ Zerubabel nwa Shealtiel, onye na-achị Juda, na mmụọ Joshua nwa Jehozadak, onyeisi nchụaja na mmụọ ndị niile ahụ fọdụrụ nʼala ahụ. Ha niile bịara bido ọrụ nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke ha,

Haggai 1:14 (UKJV) And the LORD stirred up the spirit of Zerubbabel the son of Shealtiel, governor of Judah, and the spirit of Joshua the son of Josedech, the high priest, and the spirit of all the remnant of the people; and they came and did work in the house of the LORD of hosts, their God,

12Mgbe ahụ, Zerubabel nwa Shealtiel, na Joshua nwa Jehozadak, onyeisi nchụaja, na ndị niile fọdụrụ, ṅara ntị nʼolu Onyenwe anyị Chineke ha, na nʼozi Hegai onye amụma, dịka Onyenwe anyị Chineke ha zitere ya. Ndị Izrel niile tụkwara egwu Onyenwe anyị.

13Mgbe ahụ Hegai, onyeozi Onyenwe anyị, ziri ndị mmadụ ahụ niile ozi Onyenwe anyị, sị: “Mụ onwe m nọnyeere unu,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

14Ya mere, Onyenwe anyị kwaliri mmụọ Zerubabel nwa Shealtiel, onye na-achị Juda, na mmụọ Joshua nwa Jehozadak, onyeisi nchụaja na mmụọ ndị niile ahụ fọdụrụ nʼala ahụ. Ha niile bịara bido ọrụ nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke ha,

15nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ, nʼọnwa nke isii. Ọ bụ nʼafọ nke abụọ, nke ọchịchị eze Daraiọs,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.