Hegai 1

Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị bịara site nʼọnụ Hegai, onye amụma na-asị,

Haggai 1:3 (UKJV) Then came the word of the LORD by Haggai the prophet, saying,

1Ozi Onyenwe anyị, nke rutere Hegai onye amụma, nke o ziri Zerubabel nwa Shealtiel, onye na-achị Juda, na Joshua nwa Jehozadak, onyeisi nchụaja. Ozi a rutere ya nʼafọ nke abụọ nke ọchịchị eze Daraiọs, nʼụbọchị nke mbụ nʼọnwa nke isii.

2Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, “Ndị a na-asị, ‘Nʼoge ahụ erubeghị mgbe anyị ga-ewu ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.’ ”

3Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị bịara site nʼọnụ Hegai, onye amụma na-asị,

4“Nke a ọ bụ oge unu onwe unu ji ebi nʼụlọ unu e ji osisi machie, mgbe ụlọnsọ ukwu a nọgidere na-adakpọsị?”

5Ugbu a, ihe a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, “Lezienụ ụzọ unu anya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.