Hegai 1

Ihe a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, “Chezienụ echiche banyere ndụ unu.

Haggai 1:7 (UKJV) Thus says the LORD of hosts; Consider your ways.

5Ugbu a, ihe a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, “Lezienụ ụzọ unu anya.

6Unu na-agha mkpụrụ, ma na-enweta naanị ihe ntakịrị. Unu na-eri nri, ma ihe unu na-eri adịghị ezuru unu. Unu na-aṅụ ihe ọṅụṅụ ma unu adịghị aṅụju afọ ka o si mmasị unu. Unu na-eyikwasị onwe unu uwe, ma ọ dịghị achụ unu oyi. Unu na-anata ụgwọ ọrụ, maọbụ nʼakpa puru epu ka unu na-etinye ya.”

7Ihe a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, “Chezienụ echiche banyere ndụ unu.

8Jeenụ nʼelu ugwu, wedata osisi, jiri ya wuo ụlọnsọ ukwu ahụ. Mgbe ahụ, obi ga-atọ m ụtọ na ya, a ga-asọpụkwara m nʼebe ahụ.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwuru.

9“Unu na-ele anya ihe ukwu, ma lee, ọ bụ naanị ihe ntakịrị ka ọ pụtara. Mgbe unu welatara ha nʼụlọ, a fụfụsiri m ha niile. Nke a ọ bụ nʼihi gịnị?” Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara. “Ọ bụ nʼihi na ụlọnsọ ukwu m, nke nọgidere na-abụ mkpọmkpọ ebe, ma onye ọbụla nʼime unu na-agba mbọ ịrụ naanị ihe gbasara ụlọ nke aka ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.