11“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Jụọ ndị nchụaja ihe iwu na-ekwu.
12Ọ bụrụ na mmadụ etinye anụ e doro nsọ nʼakpa uwe ya, ọ bụrụkwa na uwe ahụ anụ nsọ ahụ dị nʼime ya emetụ achịcha, maọbụ ofe, maọbụ nri ọzọ dị iche, mmetụ uwe ahụ metụrụ ha ọ ga-eme ka ha dịrị nsọ?’ ” Ndị nchụaja zara sị: “Mba!”
13Mgbe ahụ Hegai kwukwara, “Ọ bụrụ na mmadụ emerụọ onwe ya site nʼimetụ onye nwụrụ anwụ aka, mesịa metụ otu nʼime ihe ndị a aka, ọ ga-abụ ihe rụrụ arụ?” Ndị nchụaja zara sị, “E, ọ ga-abụ ihe rụrụ arụ.”
14Mgbe ahụ Hegai kwuru sị, “ ‘Otu a ka mba a na ndị bi nʼime ya dị nʼihu m. Ihe ọbụla aka ha rụpụtara na onyinye ọbụla ha nyere bụ ihe rụrụ arụ.’ Ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwuru.
15“ ‘Ma ugbu a, chezienụ echiche banyere ihe ndị ga-emenụ site taa gaa nʼihu. Tuleenụ otu ihe si dị tupu adọnye otu nkume nʼelu ibe ya nʼụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.