Hegai 2

“ ‘Ma ugbu a, chezienụ echiche banyere ihe ndị ga-emenụ site taa gaa nʼihu. Tuleenụ otu ihe si dị tupu adọnye otu nkume nʼelu ibe ya nʼụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.

Haggai 2:15 (UKJV) And now, I pray you, consider from this day and upward, from before a stone was laid upon a stone in the temple of the LORD:

13Mgbe ahụ Hegai kwukwara, “Ọ bụrụ na mmadụ emerụọ onwe ya site nʼimetụ onye nwụrụ anwụ aka, mesịa metụ otu nʼime ihe ndị a aka, ọ ga-abụ ihe rụrụ arụ?” Ndị nchụaja zara sị, “E, ọ ga-abụ ihe rụrụ arụ.”

14Mgbe ahụ Hegai kwuru sị, “ ‘Otu a ka mba a na ndị bi nʼime ya dị nʼihu m. Ihe ọbụla aka ha rụpụtara na onyinye ọbụla ha nyere bụ ihe rụrụ arụ.’ Ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwuru.

15“ ‘Ma ugbu a, chezienụ echiche banyere ihe ndị ga-emenụ site taa gaa nʼihu. Tuleenụ otu ihe si dị tupu adọnye otu nkume nʼelu ibe ya nʼụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.

16Kedụ ọnọdụ unu? Mgbe mmadụ bịara nʼebe o debere ọtụtụ iri efere ọka abụọ, ihe ọ na-ahụ bụ naanị ọtụtụ efere ọka iri. Ọ bụrụkwa na ọ bịa nʼebe ịnara mmanya ka o were iri ite mmanya ise, ọ bụ naanị iri ite mmanya abụọ ka ọ ga-enweta.

17Eji m ọrịa na-eripịa ihe ubi, na ọmụma ebu, na mkpụrụ mmiri igwe bibie ọrụ aka unu niile; ma unu alọghachikwuteghị m,’ ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwupụtara.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.