Hegai 2

Kedụ ọnọdụ unu? Mgbe mmadụ bịara nʼebe o debere ọtụtụ iri efere ọka abụọ, ihe ọ na-ahụ bụ naanị ọtụtụ efere ọka iri. Ọ bụrụkwa na ọ bịa nʼebe ịnara mmanya ka o were iri ite mmanya ise, ọ bụ naanị iri ite mmanya abụọ ka ọ ga-enweta.

Haggai 2:16 (UKJV) Since those days were, when one came to an heap of twenty measures, there were but ten: when one came to the pressfat in order to draw out fifty vessels out of the press, there were but twenty.

14Mgbe ahụ Hegai kwuru sị, “ ‘Otu a ka mba a na ndị bi nʼime ya dị nʼihu m. Ihe ọbụla aka ha rụpụtara na onyinye ọbụla ha nyere bụ ihe rụrụ arụ.’ Ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwuru.

15“ ‘Ma ugbu a, chezienụ echiche banyere ihe ndị ga-emenụ site taa gaa nʼihu. Tuleenụ otu ihe si dị tupu adọnye otu nkume nʼelu ibe ya nʼụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.

16Kedụ ọnọdụ unu? Mgbe mmadụ bịara nʼebe o debere ọtụtụ iri efere ọka abụọ, ihe ọ na-ahụ bụ naanị ọtụtụ efere ọka iri. Ọ bụrụkwa na ọ bịa nʼebe ịnara mmanya ka o were iri ite mmanya ise, ọ bụ naanị iri ite mmanya abụọ ka ọ ga-enweta.

17Eji m ọrịa na-eripịa ihe ubi, na ọmụma ebu, na mkpụrụ mmiri igwe bibie ọrụ aka unu niile; ma unu alọghachikwuteghị m,’ ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwupụtara.

18‘Ma site nʼụbọchị taa gaa nʼihu, site nʼụbọchị taa bụ iri ụbọchị anọ nke ọnwa itoolu, chenụ echiche banyere ụbọchị a bụ ụbọchị a tọrọ ntọala ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. Chezienụ echiche banyere ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.