Ndị Hibru 1

Ị hụrụ ezi omume nʼanya ma kpọọ ihe ọjọọ asị. Nʼihi nke a, Chineke, nke bụ Chineke gị, emeela ka ịdị elu karịa ndị ibe gị niile site na ite gị mmanụ nke ọṅụ.”

Hebrews 1:9 (UKJV) You have loved righteousness, and hated iniquity; therefore God, even your God, has anointed you with the oil of gladness above your fellows.

7O kwukwara banyere ndị mmụọ ozi ya, ọ sịrị, “Ọ na-eme ndị mmụọ ozi ya ka ha bụrụ ikuku, na-emekwa ndị na-ejere ya ozi ka ha bụrụ ire ọkụ.”

8Ma banyere Ọkpara ahụ, ọ sịrị, “Ocheeze gị, O Chineke, ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Mkpara omume ziri ezi ka mkpara alaeze gị ga-abụ.

9Ị hụrụ ezi omume nʼanya ma kpọọ ihe ọjọọ asị. Nʼihi nke a, Chineke, nke bụ Chineke gị, emeela ka ịdị elu karịa ndị ibe gị niile site na ite gị mmanụ nke ọṅụ.”

10Ọ sịkwara, “Na mmalite, Onyenwe anyị, ọ bụ gị tọrọ ntọala ụwa, eluigwe bụkwa ọrụ aka gị.

11Ha ga-ala nʼiyi, ma gị onwe gị ga-anọgide. Ha niile ga-aka nka dịka uwe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.