32Ma chetakwanụ ụbọchị mbụ ndị ahụ, mgbe unu natachara ìhè, unu nọgidesikwara ike nʼagbanyeghị oke ahụhụ niile unu tara.
33Mgbe ụfọdụ, a kparịrị unu nʼihu ọha, unu natakwara mkpagbu. Nʼoge ọzọ, unu soro ndị e si otu a mesoo mmeso.
34Unu were obi ebere soro ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ taa ahụhụ, unu jikwa ọṅụ nabata ya mgbe a nakọrọchara unu ihe niile unu nwere, nʼihi na unu onwe unu matara na unu nwere ihe ka mma, nke na-anọgide.
35Ya mere, unu ahapụkwala ntụkwasị obi unu ahụ, nʼihi na ọ na-eweta ụgwọ ọrụ dị ukwuu.
36Nʼihi ya, unu kwesiri inwe ndidi ka ọ ga-abụ na mgbe unu mere uche Chineke unu ga-anata ihe e kwere na nkwa.