11Site nʼokwukwe ọ natara ike ọmụmụ. Ọ bụ ezie na ọ gafeela oge ịmụta nwa, ọ bụladị Sera nʼonwe ya bụ nwanyị aga, nʼihi na ọ gụrụ onye ahụ kwere ya nkwa dị ka onye kwesiri ntụkwasị obi.
12Ya mere site nʼotu onye a, onye a gụrụ dị ka onye nwụrụ anwụ ka e si nweta ụmụ ndị ọnụọgụgụ ha dị ka kpakpando dị na mbara eluigwe, dị ka aja dị nʼakụkụ osimiri.
13Ndị a niile nwere okwukwe nwụrụ na-anataghị nkwa ahụ, ma site nʼebe dị anya ha hụrụ ma nabatakwa nkwa ndị a. Ha kwupụtakwara na ha bụ ndị ọbịa na ndị mba ọzọ nʼụwa.
14Ndị na-ekwu otu a na-ezipụta na ha na-ele anya obodo nke aka ha.
15Ọ bụrụ na ha na-eche echiche banyere obodo nke ha hapụrụ, ha gaara enwe ohere ịlaghachi azụ.