15Ọ bụrụ na ha na-eche echiche banyere obodo nke ha hapụrụ, ha gaara enwe ohere ịlaghachi azụ.
16Ma otu ọ dị, ha na-elesi anya ike maka obodo ahụ ka mma, bụ nke dị nʼeluigwe. Ya mere, ọ dịghị eme Chineke ihere ka a kpọ ya Chineke ha, nʼihi na o dozielara ha ebe obibi.
17Site nʼokwukwe Ebraham ji Aịzik chụọ aja mgbe a nwalere ya. Onye ahụ natara ihe ndị ahụ e kwere nkwa, dị njikere iji otu nwa ahụ o nwere chụọ aja,
18ọ bụ ezie na Chineke kwuru maka ya, “Ọ bụ site nʼAịzik ka a ga-akpọ mkpụrụ gị aha.”
19Ebraham chere na Chineke pụrụ ime ka onye nwụrụ anwụ site nʼọnwụ bilie, dịka ihe ịma atụ otu ahụ ka o mekwara, nʼihi na ọ nataghachikwara ya.