21Ọ bụ okwukwe ka Jekọb ji gọzie ụmụ Josef nʼotu nʼotu tupu ọ nwụọ. Ọ kpọrọ isiala dịka ọ dabere nʼelu mkpanaka ya.
22Nʼọgwụgwụ ndụ ya, Josef sitere nʼokwukwe kwuo banyere ọpụpụ ụmụ Izrel ma nyekwa ntụziaka banyere olili ọkpụkpụ ya.
23Okwukwe ka nne na nna Mosis ji zobe ya ọnwa atọ mgbe a mụrụ ya, nʼihi na ha hụrụ na ọ bụ nwa mara mma. Ha atụkwaghị egwu iwu eze ala Ijipt bụ Fero nyere.
24Site nʼokwukwe, Mosis e kweghị aza nwa ada Fero mgbe o tolitere.
25Ọ họọrọ isoro ụmụ Chineke keta oke na mmegbu ha karịa inwe aṅụrị nke mmehie.