23Okwukwe ka nne na nna Mosis ji zobe ya ọnwa atọ mgbe a mụrụ ya, nʼihi na ha hụrụ na ọ bụ nwa mara mma. Ha atụkwaghị egwu iwu eze ala Ijipt bụ Fero nyere.
24Site nʼokwukwe, Mosis e kweghị aza nwa ada Fero mgbe o tolitere.
25Ọ họọrọ isoro ụmụ Chineke keta oke na mmegbu ha karịa inwe aṅụrị nke mmehie.
26O kpebiri na ọ bụ ihe karịchara mma ịhụ ahụhụ nʼihi Kraịst, kama inweju akụ niile nke Ijipt afọ. Nʼihi na o nwere olileanya maka ụgwọ ọrụ dị nʼihu.
27Okwukwe ka ọ ji hapụ Ijipt. Ọ tụghị egwu iwe eze, ma ọ tachịrị obi ya dịka ọ hụrụ onye ahụ a na-apụghị ịhụ anya.