Ndị Hibru 11

Site nʼokwukwe, Noa, onye nke a dọrọ aka na ntị gbasara ihe ndị a na-ahụbeghị anya, gere ntị ma ruo ụgbọ mmiri maka nzọpụta nke ezinaụlọ ya. Site na nke a, ọ mara ụwa ikpe, ma bụrụ onye nketa nke ezi omume sitere nʼokwukwe.

Hebrews 11:7 (UKJV) By faith Noah, being warned of God of things not seen as yet, moved with fear, prepared an ark to the saving of his house; by the which he condemned the world, and became heir of the righteousness which is by faith.

5E sitere nʼokwukwe kupu Enọk nke pụtara na ọ nwụghị anwụ, a hụkwaghị ya ọzọ nʼihi na Chineke akpọrọla ya. Ma tupu e kuru ya, e mere ka anyị mara na ọ mere ihe masịrị Chineke.

6Ọ bụ ihe siri ike mmadụ ime ihe ga-atọ ya ụtọ ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị okwukwe. Nʼihi na onye na-abịakwute Chineke nso aghaghị ikwe na ọ dị. Na ọ bụkwa onye na-akwụghachi onye ọbụla na-achọsi ya ike ụgwọ.

7Site nʼokwukwe, Noa, onye nke a dọrọ aka na ntị gbasara ihe ndị a na-ahụbeghị anya, gere ntị ma ruo ụgbọ mmiri maka nzọpụta nke ezinaụlọ ya. Site na nke a, ọ mara ụwa ikpe, ma bụrụ onye nketa nke ezi omume sitere nʼokwukwe.

8Site nʼokwukwe, Ebraham rubere isi mgbe a kpọrọ ya ka ọ hapụ, gaa nʼala ahụ nke ọ ga-enweta dịka ihe nketa. Ọ gawara nʼamaghị ebe ọ na-aga.

9Okwukwe ka o jiri biri dịka ọbịa nʼala ahụ e kwere ya na nkwa, na-ebi nʼụlọ ikwu, ya na Aịzik na Jekọb, bụ ndị e kwere ya na ha otu nkwa ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.