12Ya mere, setịpụ aka gị ahụ ike gwụrụ. Guzosie ike nʼụkwụ gị ahụ na-ama jijiji.
13Debenụ ụkwụ unu nʼụzọ ziri ezi, ka ụkwụ na-adịghị ike ghara ịda ngwụrọ, kama ka o nwe ọgwụgwọ.
14Gbalịsie ike mee ka gị na mmadụ niile biri nʼudo ya na ndụ dị nsọ, e wepụ ya, o nweghị onye pụrụ ịhụ Onyenwe anyị.
15Hụkwanụ na o nweghị onye ga-ahapụ inweta amara Chineke, na o nwekwaghị onye ga-epupụta dịka mgbọrọgwụ ilu weta nsogbu a ga-esi nʼime ya merụọ ọtụtụ mmadụ.
16Hụnụ na o nweghị onye na-ebi ndụ ruru unyi maọbụ onye nke na-enweghị nsọpụrụ dịka Ịsọ, onye nke rere ọnọdụ ọmụmụ ya nʼihi otu efere nri.