21Nʼezie, ihe ahụ anya hụrụ dị oke egwu na Mosis sịrị, “Ana m ama jijiji nʼihi ụjọ.”
22Ma unu abịaruola nʼugwu Zayọn, bụ obodo Chineke dị ndụ, Jerusalem nke eluigwe ahụ. Unu abịakwutela puku kwụrụ puku ndị mmụọ ozi a na-apụghị ịgụta ọnụ zukọrọ nʼọṅụ.
23Unu abịala nʼụlọ nzukọ nke onye ahụ ebu ụzọ mụpụta bụ ndị e dere aha ha nʼeluigwe. Unu abịakwutela Chineke, onye ga-ekpe mmadụ niile ikpe, unu abịakwutela mmụọ ndị ezi omume e mere ka ha bụrụ ndị zuruoke.
24Unu abịakwutela Jisọs onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, bịakwutekwa ọbara e fesara nke na-ekwu okwu dị mma karịa nke ọbara Ebel kwuru.
25Gbalịsienụ ike ihu na unu ajụghị onye ahụ na-ekwu okwu. Nʼihi na ọ bụrụ na ha agbanarịghị ya, bụ onye ahụ dọrọ ha aka na ntị nʼelu ụwa, anyị agaghị agbanarị onye ahụ si nʼeluigwe na-adọ anyị aka na ntị.