23Unu abịala nʼụlọ nzukọ nke onye ahụ ebu ụzọ mụpụta bụ ndị e dere aha ha nʼeluigwe. Unu abịakwutela Chineke, onye ga-ekpe mmadụ niile ikpe, unu abịakwutela mmụọ ndị ezi omume e mere ka ha bụrụ ndị zuruoke.
24Unu abịakwutela Jisọs onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, bịakwutekwa ọbara e fesara nke na-ekwu okwu dị mma karịa nke ọbara Ebel kwuru.
25Gbalịsienụ ike ihu na unu ajụghị onye ahụ na-ekwu okwu. Nʼihi na ọ bụrụ na ha agbanarịghị ya, bụ onye ahụ dọrọ ha aka na ntị nʼelu ụwa, anyị agaghị agbanarị onye ahụ si nʼeluigwe na-adọ anyị aka na ntị.
26Nʼoge ahụ, olu ya mere ka ụwa ma jijiji, ma ugbu a, ọ kwela nkwa, sị, “Otu mgbe ọzọ fọdụrụ, ọ bụghị naanị ụwa ka m ga-eme ka ọ maa jijiji kama aga m emekwa ka eluigwe maa jijiji.”
27Okwu a bụ, “Otu mgbe ọzọ fọdụrụ,” na-egosi mwepụ nke ihe na-ama jijiji dịka ihe e kere eke, iji hụ na nke na-anaghị ama jijiji ga-adị.